Tuesday, 9 August 2016
AGHUGHO DUM DUM
ONYE AGHOGBURU KA-AGBARA!!!
Ihe niile agbanwego, n'agba ochie, a na-atu n'ilu na-asi na ihe okenye no n'ala were hu, nwata kwurugodi oto ogaghi ahu ya. Mana ugbua o bu nwata na-agwa okenye ihe o ga ahu. N'ihi gini? Otutu ndi kporo onwe ha okenye kazi ndi bu umuaka ezuzu ezuzu (chetakwa na o bu nzuzu ka-eji aba eligwe ooo).
Nigeria bu obodo mara mma nke ukwuu, m gana asopuru obodo m bu Nigeria ma o di mma ma o di njo. Ma a na-anwu anwu ,ma a na-adi ndu. Nigeria ka bu omaricha obodo m.
Nsogbu nchoputara ji ezigbo obodo m bu Nigeria bu na otutu ndi mmadu chere na Nigeria ka kpuru isi dika o di n'oge gboo. Ebe mmadu ga-anara onyinye enyonyo naani ka o were buru odibo onye ozo. Obughizi oge a ga-abia n'ulo gi nara nri ma were nsi kwuo gi ugwo, ginwa ewere obi ocha nabata ya n'ihi udo na ndu gi. Mbaaaa!!!! Nigeria ahula uzo, ìhè abatara!!!
Oge ugbua abughi oge a na-aturu ndi isi anyi n'ilu si "were ehihe choba ewu ojii" n'ihe na chi ejibidogo ndi ochichi obodo m nke na ha na-ejidezi aturu na-egosi anyi, chee na o bu ewu!!!
Ekelee m onye isi ala maka aha ojiri puta ochichi bu MGBANWE. Eziokwu ihe na-agbanwe kwa ubochi, otutu ndi okenye na-eme ka umuaka ebe umuaka na-eme ka onye, ndi okenye jizi asiri eme nri.
Kedu ka mmadu siri ga aputa n'ihu oha gwa ndi mmadu na o bu agha kpatara uko tomato,(aha onye na-edu ya) hmmmm onwekwara ike i bu eziokwu ooo, makana ogbunigwe nwere ike imebi ala ubi ebe a na-ako ihe. onye aghogburu ka-agbara.
Ozo dika ibe ya were buru ihe na-eme n'obodo m n'oge ugbua, a na-atu n'ilu na-asi na o bu sooso osisi ka a ga-asi na a ga-egbu ya, okwuru ebe okwu. Nna m ukwuu bu onye isi obodo achokatago etu o ga-esi merie umunne m bu ndi Naija Delta mana ochoputara na-obughi egwu achi utaba na-aka were agba. Okpebiri i bonye onwe ya oya nti, oge o nuru na umunne m si na o bu Aso rock bu ebe ozo ha ga-akpa mkpamkpa.
Umunne o buru gi bi n'Aso rock i ga-ano hu ihe a ka o na-abia??? Onye isi m mere ihe okwesiri ime, mana lezie ka Femi Adesina siri gosi amamihe ya, na o bu onye aghogburu ka agbara site n'igwa oha mmadu na onweghi oya ji onye isi ala. Ebum n'uche na o mere nke a ka okpuchie ihe ihere di na onye isi ala no n'oya nti mgbu. Adesina jisiri ike na-emehe ike okuko chee na o na-egbochi ikuku(keduzi okenye anyi ga-esozi nókwu ahu ike onye isi ala anyi). Ma ndumodu m na-enye onye isi ala bu ka o ka nodu ebe ahu tutu obi umu nne m adatuooo. Mana o burukwa eziokwu na nti na-egbu ya, oputara na dokinta niile no na nigeria enweghi ike igwo ya oya nti? aru!!! Ozokwa echetere m ihe onye isi ala m kwuru "onweghi onye obodo m ga-akwado maka i ga obodo oyibo maka ahu ike beelu so ma oya ahu o siri ike ogwugwo na nigeria,(http://www.punchng.com/no-allowance-officials-foreign-medical-treatment-fg/) lekwanu ka onye isi na-abu onwe ya onu. onye aghogburu ka-agbara.
Onye isi obodo m anapugo otutu ndi mmadu ikike eji aga ala bekee, mana a na m ekele Ayodele Fayose onye mara ya aka n'ihu si ya na onweghi ike nke a n'ebe ya onwe ya bu Fayose no.(http://www.premiumtimesng.com/news/more-news/204385-fayose-dares-buhari-stop-travelling-abroad-says-i-cant-cowed.html) onye aghogburu ka agbara
Keduzi ebe anyi na-aga aga??? Kedu ka ihe ga-esi na-aga aga n'obodo ebe i ga-etete ura, otu olu a si gi gbaba aka ekpe gi ,olu ozo asi gi gbaba aka nri, nwanne keduzi nke i ga-eme na abughi ikwuru otu ebe.
Echetere m n'afo 2005, October 23 ozi biara anyi na nwunye onye isi obodo m nwuru n'ulo ogwu di na obodo Spain, onye o bula no na-eti mkpu nwute, Mana n'oge na-eteghi aka, ezite ozi na o bu asi. Ihe mere ejiri kwuo na onwuru bu na ochoro igba oso, gbahapu di ya bu onye isi ala n'ihi mmepa ahu o na-emekpa ndi Igbo. tufiakwa O bu etu a ka esiri mee n'afo 2010 n'oge Umaru Musa. Onye ka aghogburu??
O dikwa m ka o bu na gomenti ka o ka njo, "m ga-ebutu ego naira ka o buru otu ihe n'ebe dollar no( http://www.vanguardngr.com/2015/03/ill-make-naira-equal-in-value-to-dollar-says-buhari). M ga-ebutu ego mmanu eji akwo ugboala ka o buru akpa ego abuo (http://www.dailyafricagist.com/discussion/3143/suggest/ ) .Onwere onye ihe oma na-aso nso? Onye obula ebinyesia aka n'oge nhoputa, keduzie onye aghogbuziri?. O bu etu a ka esiri kwe umu mmadu nkwa oru n'otu steeti, mana ka-emesiri nghoputa, mmadu ole ka-enyere oru? Onye aghoputakwara burukwuo onye anuruma. Onye aghogburu ka-agbara.
Abia n'egwuregwu, nwatakiri muna ya gbara o no n'etiti n'oge anyi di na nwata gara igbara ndi no n'abgata afo iri na asaa boolu hahahah,. Agadi nwanyi na-ebu m uzo achiri oke n'oge anyi di na nwata kwadoro onwe ya ofuma, gaba izo ada onicha "miss onitcha" emebeere maka ndi erubeghi afo iri abuo na abuo, onye aghogburu!!!
N'otu obodo, n'akwamozu otu onye nkuzi, otu akwukwo nke bekee kporo poster(nke ezinulo biputara) dere na nwoke a di afor iri ise na ano, mana obere akwukwo ejiri nye onyinye nke bekee kporo jotter (nke umunne ya biputara)dere na odi afo iri isii na isii.
Ana ekwu ole ghara ole, echetere m oge ekwuru n'okwu si na otu n'ime ihe bu aru okenye kwesiri i di na-eze bu ASIRI mana ugbua aru gbaa afo o buru omenaala, okenye ma nwata jizi asiri anafere n'ihe obula. Onyekwanu ka i ga-ata uta? Ebe o bu na ikwuo eziokwu, inwere onwe gi n'ala eze eligwe ma buru onye eji eji n'uwa. Ndi kporo onwe ha ndi ozioma Chineke na-ejizi aghugho eri ego nke ha n'ihi nzuzu ndi uwa, ebe ndi uwa na-acho manna si n'eligwe. O bu etu a ka otu ezinulo siri ree ihe niile ha nwere n'ihi ujo onye ozioma yiri ha, onye aghogburu ka agbara.
Ewepugo omumu na-akuzi maka akuko n'ulo akwukwo Sekondiri, n'udi ka ezobe otutu eziokwu mere n'oge ochie, mana ahinze ogbara igbo gharii bu computa, ahinze googulu,echere m na ndi ochichi n'oke amamihe ha ga-egbochi computa n'ulo akwukwo n'ihi na umu akuko a ha na-ezochi juru n'ime computa. Eziokwu achoputara m na ka a na-agba mbo ka ejide okuku ka ikuku ghapu iku ya,o bu oge ahu ka ezigbo ikuku na-ekughe ike ya.
Umunne m, oge erugo oge anyi ga agbanwe, saa anya anyi mmiri mara oge aghogbuwere anyi. Ukpa ekele m na- agara onye isi anyi weteere anyi MGBANWE were na-asi anyi na oge mgbanwe eruola.Ka anyi jidesie aha ahu ike, ka anyi gbanweenu echiche ochie anyi. Ime ihe obodo na uka kwuru mara mma nke ukwuu mana ikwesiri inyocha ofuma ufodu iwu, ka iwere mata oge oke gi na-efu. Ekwena ka aghogbuo gi, ma gi aghogbukwana mmadu, ka udo were na-achi n'ala anyi a.
Ka amra Chineke chekwaba anyi n'oge niile nke ndu anyi amen.
Subscribe to:
Post Comments (Atom)
System Mechanic Pro Crack
ReplyDelete
ReplyDeleteuninstall-and-remove-microsoft-office-crack
fails to install the updated version or another program after uninstalling MS Office crack. Many computer users cannot completely uninstall the program for one reason or another.
freeprokeys
I really enjoy reading your post about this Posting. This sort of clever work and coverage! Keep up the wonderful works guys, thanks for sharing Piriform Recuva Pro Crack
ReplyDeleteEz Cd Audio Converter Pro Crack
ReplyDeleteIobit Driver Booster Pro Crack
Cracks
Airserver Crack
Adaware Antivirus Crack
Nicrosoft Office Crack
Wow, this piece of writing is pleasant, my younger sister is analyzing such things, therefore I am going to tell her.
ReplyDeletemount and blade warband activation code
mp3 studio license key
slimcleaner plus serial key
gihosoft registration email and key
revit crack
Crack Like
Great post, but I wanted to know if you can write
ReplyDeletesomething else on this topic? I would really appreciate it if you can explain this.
A bit more. Appreciation
xmedia recode crack
tweakbit driver updater crack
vmware workstation pro crack
They say that the Devil works hard. Everyone’s wrong. You work harder. We’re so proud of you.
ReplyDeletexsplit broadcaster crack
anytrans for android crack
ef commander crack
This is really beneficial software for both you and me.
ReplyDeleteNo errors were detected during the audit.
It's something you can take advantage of. I hope you find it nice.
bandicam screen recorder crack
revo uninstaller pro crack
movavi video editor crack
wondershare mockitt crack
I am very impressed with your post because this post is very beneficial for me and provide a new knowledge to me. this blog has detailed information, its much more to learn from your blog post.I would like to thank you for the effort you put into writing this page.
ReplyDeleteI also hope that you will be able to check the same high-quality content later.Good work with the hard work you have done I appreciate your work thanks for sharing it. It Is very Wounder Full Post.This article is very helpful, I wondered about this amazing article.. This is very informative.
“you are doing a great job, and give us up to dated information”.
bluestacks-5-4-100-1025-crack-license-key-free-download-2022/
coolutils-pdf-combine-7-1-0-37-crack-license-key-free-download-2022/
videoscribe-crack/
aurora-hdr-1-2-2-crack-activation-key-free-download-2022/
bitsum-cpubalance-pro-1-0-0-92-crack-license-key-free-download-2022/